Genesis 11

Ụlọ elu Babel

1Nʼoge ahụ, ụwa niile nwere naanị otu asụsụ, okwu niile bụkwa otu. 2Mgbe ndị mmadụ gbasara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ha chọtara ala dị larịị na Shaịna biri nʼebe ahụ.

3Ha gwarịtara onwe ha okwu sị, “Bịanụ ka anyị kpụọ brik,
Maọbụ, Aja ụrọ
kpọọ ha ọkụ nke ọma.” Ya mere, ha kpụrụ brik kama nkume, jirikwa bitumen kama ụrọ.
4Mgbe ahụ, ha kwuru sị, “Bịanụ ka anyị wuore onwe anyị obodo na ụlọ elu, nke elu ya ga-eru nʼeluigwe, ka anyị si otu a meere onwe anyị aha, ka anyị ghara ịbụ ndị a ga-agbasa nʼụwa niile.”

5 Onyenwe anyị rịdatara hụ obodo ahụ na ụlọ elu ahụ ndị mmadụ na-ewu. 6Onyenwe anyị sịrị, “Lee! Ọ bụrụ na ha malitere ime ihe dị otu a, ugbu a ha bụ otu ndị, nweekwa otu asụsụ, o nweghị ihe ha zubere ime nke ha na-apụghị ime. 7Ngwa, ka anyị rịda gaa gbarụọ asụsụ ha, ka onye o bụla ghara ịghọta asụsụ ibe ya.”

8 Onyenwe anyị mere ka ha gbasaa nʼelu ụwa niile. Ha kwụsịkwara iwu obodo ahụ. 9Ọ bụkwa nke a mere e ji kpọọ obodo ahụ Babel
Babel ya bụ Babilọn pụtara ọgbaaghara nʼasụsụ Hibru.
nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị wetara ọgbaaghara nʼasụsụ ndị niile bi nʼụwa. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị si gbasasịa ha nʼelu ụwa dum.

Site na Shem ruo Ebram

10Nke a bụ akụkọ banyere usoro ezinaụlọ Shem.

Mgbe afọ abụọ gafechara site nʼoge uju mmiri ahụ, nʼoge Shem gbara narị afọ, ọ mụtara Apakshad.
11Shem dịrị ndụ, mgbe ọ mụsịrị Apakshad, narị afọ ise ọzọ, mụtakwa ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
12Mgbe Apakshad gbara iri afọ atọ na ise, ọ mụtara Shela. 13Mgbe ọ mụchara Shela, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na atọ ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
14Shela gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ nwa ya nwoke Eba. 15Mgbe ọ ghọrọ nna Eba, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na atọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
16Eba gbara iri afọ atọ na anọ mgbe ọ mụrụ Peleg. 17Mgbe ọ ghọrọ nna Peleg, ọ dịrị ndụ narị afọ anọ na iri atọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
18Peleg gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ Reu. 19Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Reu, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ na itoolu ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
20Reu gbara iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ mụrụ Serug. 21Emesịa, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ na asaa ọzọ, mgbe ọ mụsịrị Serug, ọ mụtakwara ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
22Serug gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ Nahọ. 23Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Nahọ, ọ dịrị ndụ narị afọ abụọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
24Nahọ gbara iri afọ abụọ na itoolu mgbe ọ mụrụ Tera. 25Emesịa, mgbe ọ ghọrọ nna Tera, ọ dịrị ndụ narị afọ na afọ iri na itoolu ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
26Mgbe Tera gbara iri afọ asaa, ọ ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran.

Ezinaụlọ Ebram

27Nke a bụ akụkọ gbasara usoro ezinaụlọ Tera.

Tera ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran. Haran ghọrọ nna Lọt.
28Haran nwụrụ nʼihu nna ya Tera nʼala ebe a nọ mụọ ya, nke bụ na Ụọ, obodo ndị Kaldịa. 29Ebram na Nahọ lụrụ nwunye. Aha nwunye Ebram bụ Serai ma aha nwunye Nahọ bụ Milka. Milka bụ nwa Haran, onye bụ nna Milka na Iska. 30Ma Serai bụ nwanyị aga, ọ mụtaghị nwa ọbụla.

31Tera kpọrọ nwa ya Ebram, na nwa nwa ya Lọt, onye bụ nwa Haran,
Haran bụ aha mmadụ, bụrụkwa aha obodo dị nʼala Mesopotamịa. Obodo e ji ife ọnwa mara, dị ka a makwaara obodo Ụọ.
na nwunye nwa ya Serai, bụ nwunye Ebram, duru ha hapụ Ụọ, obodo ndị Kaldịa, pụọ gawa nʼala Kenan. Ma mgbe ha bịarutere nʼobodo Haran, ha kwụsịrị biri nʼebe ahụ.

32Ọ bụ nʼobodo Haran ka Tera nọ nwụọ, mgbe ọ gbara narị afọ abụọ na ise.

Copyright information for IboBIU